1 Kings 2:44-46

44Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ a niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị. 45Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”

46Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ.

Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya.

Copyright information for IboBIU